Abụ Ọma 111
Toonu Onyenwe anyị
Toonu Onyenwe anyị!
 
Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma
nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu.
 
Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu;
ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha.
Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma,
ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile;
Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko.
Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri;
ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
 
O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile,
site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.
Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi;
ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi.
E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi,
ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi.
O wetaara ndị ya mgbapụta;
o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi,
aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu.
 
10 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe;
ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta.
Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.