Abụ Ọma 113
Abụ otuto
Toonu Onyenwe anyị!
 
Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya.
Toonu aha Onyenwe anyị.
Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi
site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya,
aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto.
 
Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile,
ebube ya dị elu karịa eluigwe.
Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị,
onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu,
onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị
eluigwe na ụwa anya?
 
Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu
sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;
ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ,
ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.
Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya
dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi.
 
Toonu Onyenwe anyị.