Abụ Ọma 118
Kelee Onyenwe anyị
Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma;
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
 
Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị,
“Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị,
“Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị,
“Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
 
Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,
ọ zara m, mee ka m nwere onwe m.
Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu.
Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
Onyenwe anyị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka.
Aga m ele ndị iro m anya na mmeri.
 
Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị
karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.
Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị
karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.
10 Mba niile gbara m gburugburu
ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi.
11 Ha gbara m gburugburu,
ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha.
12 Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ,
ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ;
site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha.
13 Akwaghachiri m azụ, agaara m ada,
ma Onyenwe anyị nyere m aka.
14  Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m;
ọ ghọọla nzọpụta m.
 
15 Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri
na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume:
“Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!
16 Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu;
aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!”
17 Agaghị m anwụ,
kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.
18  Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu,
ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ.
19 Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume;
aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.
20 Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị,
ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye.
21 Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m;
ị ghọọla nzọpụta m.
 
22 Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ,
aghọọla nkume isi ntọala* ụlọ;
23 nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị,
ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.
24 Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere,
ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
 
25 O Onyenwe anyị, zọpụta anyị;
o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.
 
26 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.
Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.
27  Onyenwe anyị bụ Chineke,
ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị.
Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke
bịaruo nʼebe ịchụ aja.
 
28 Ị bụ Chineke m, aga m eto gị;
ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.
 
29 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma,
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
* Abụ Ọma 118:22 118:22 Ya bụ, isi nkuku ụlọ