Abụ Ọma 120
Abụ nrigo.
Ekpere maka nnapụta
Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m,
ọ na-azakwa m.
O Onyenwe anyị, zọpụta m
site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha
na ire na-ekwu okwu aghụghọ.
 
Gịnị ka a ga-eme gị,
ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị,
gị ire aghụghọ?
Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ,
ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.
 
Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek,
nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!
Ogologo oge
ka m binyere ndị kpọrọ udo asị.
Abụ m onye udo;
ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.