Abụ Ọma 122
Abụ nrigo, nke Devid.
Ekpere maka udo Jerusalem
Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m,
“Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”*
Ụkwụ anyị eguzola ugbu a
nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.
 
E wuru Jerusalem dịka obodo
a chịkọtara ọnụ nke ọma.
Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo,
bụ ebo niile nke Onyenwe anyị,
ịbụku aha Onyenwe anyị abụ
dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị.
Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị,
bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.
 
Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem:
“Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo.
Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile
nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.”
Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m,
ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.”
Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị,
aga m achọ ọganihu gị.
* Abụ Ọma 122:1 122:1 Aịz 2:3; Mai 4:2; Zek 8:21