Abụ Ọma 124
Abụ nrigo. Nke Devid.
Ekele maka mgbapụta
A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị,
ka Izrel kwuo,
a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị,
mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,
mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị,
ha gaara eloda anyị na ndụ;
idee mmiri gaara iri anyị,
oke mmiri gaara ebufu anyị,
ebili mmiri niile
gaara ebufu anyị.
 
Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị
ka ha jiri eze ha dọrie anyị.
Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si
gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya;
ọnya ahụ agbajiela,
anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.
Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị,
onye kere eluigwe na ụwa.