Abụ Ọma 126
Abụ nrigo.
Abụ ekele maka mgbapụta
Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn,*
anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.
Ọchị juru anyị ọnụ,
abụ ọṅụ jukwara anyị ire.
Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị,
Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.”
Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu,
obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ.
 
Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị,
dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev.
Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ
ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.
Onye ji ịkwa akwa
buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga,
ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ,
mgbe ha bu ukwu ọka ha.
* Abụ Ọma 126:1 126:1 Jer 29:14; Jul 3:1