Abụ Ọma 128
Abụ nrigo.
Ngọzị dịrị ndị na-atụ egwu Onyenwe anyị
Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,
ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.
Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị;
ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.
Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị
na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;
ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv
gburugburu tebul gị.
Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ
na-atụ egwu Onyenwe anyị.
 
Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn
ụbọchị niile nke ndụ gị;
ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,
ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị.
Ka udo dịrị Izrel.*
* Abụ Ọma 128:6 128:6 Abụ 125:5