Abụ Ọma 134
Abụ nrigo.
Toonu Onyenwe anyị
Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile
ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị.
Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya*
ma toonu Onyenwe anyị.
 
Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa
site na Zayọn gọzie unu.
* Abụ Ọma 134:2 134:2 1Tm 2:8