Abụ Ọma 136
Abụ ekele
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu.
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
 
Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
 
10 Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
11 O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
12 O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha;
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
 
13 Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
14 Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
15 Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile;
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
 
16 Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
 
17 Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
18 O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
19 O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
20 Na Ọg eze Bashan,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
21 Were ala ha nye dịka ihe nketa,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
22 O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
 
23 Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
24 Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
25 Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
 
26 Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele.