Abụ Ọma 141
Abụ Ọma Devid.
Arịrịọ nke ezi mmadụ
O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ.
Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị.
Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ;
ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị.
 
Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị;
na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.
Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ,
isonye ndị na-eme ihe ọjọọ
rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche;
ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.*
 
Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere;
ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m.
Isi m agaghị ajụ ya.
Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ.
 
A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha,
mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu.
Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala,
otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.”
 
Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị
nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ.
Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri,
sitekwa nʼọnya niile ha siiri m.
10 Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha,
ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.
* Abụ Ọma 141:4 141:4 Ilu 23:6