Abụ Ọma 143
Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka enyemaka
O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m,
gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara;
nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị,
bịa nyere m aka.
Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe,
nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị.*
Onye iro na-achụ m ọsọ,
ọ na-azọpịa ndụ m nʼala;
na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị,
dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga.
Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m
ụjọ jupụtakwara m nʼobi.
Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga;
ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile
na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ.
Ana m agbasa aka m abụọ nye gị;
agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ.
Sela
 
O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ;
mmụọ m na-ada mba.
Ezonarịla m ihu gị,
ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili.
Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ,
nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi.
Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso,
nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye.
O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m,
nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m.
10 Kuziere m ime uche gị,
nʼihi na ị bụ Chineke m;
ka ezi Mmụọ gị
duo m nʼala dị larịị.
 
11 O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m;
nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu.
12 Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m;
laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi,
nʼihi na abụ m ohu gị.
* Abụ Ọma 143:2 143:2 Job 4:17; 9:2; Ekl 7:20