Abụ Ọma 149
Abụ otuto
Toonu Onyenwe anyị!
 
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ.
Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.
 
Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha;
ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze* ha.
Ka ha jiri ite egwu too aha ya
ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.
Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.
Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a,
bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.
 
Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha,
ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha,
iji bọọrọ mba niile ọbọ
taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,
iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha
na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,
imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha.
Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya.
 
Toonu Onyenwe anyị.
* Abụ Ọma 149:2 149:2 Nkp 8:23; Zek 9:9; Mat 21:5 Abụ Ọma 149:4 149:4 Abụ 132:16; Aịz 61:10 Abụ Ọma 149:6 149:6 Hib 4:12; Mkp 1:16