Abụ Ọma 22
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke “Nne ele nke ụtụtụ.” Abụ Ọma Devid.
Akwa na abụ ekele
Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?
Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m,
nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?
O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m,
nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.*
 
Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ;
ị bụ otuto ndị Izrel.
Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi;
ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.
Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara;
ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.
 
Abụ m idide, abụghị m mmadụ;
onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.
Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;
na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.
“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi;
ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya.
Ya napụta ya ebe ọ bụ
na ihe ya masịrị ya.”
 
Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m.
Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.
10 Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.
Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.
 
11 Anọla m ebe dị anya,
nʼihi na nsogbu dị nso.
Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.
 
12 Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu;
oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.
13 Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa
asaghepụla ọnụ ha megide m.
14 A wụpụla m dịka mmiri,
ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha.
Obi m agbazela dịka mmanụ,
obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.
15 Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.
Ire m na-araparakwa m nʼọnụ,
nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.
 
16 Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu;
otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu,
ha adupuola m aka m na ụkwụ m.
17 A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ;
ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị
18 Ha na-eke uwe m nʼetiti ha,
ha sitere nʼife nza kee uwe m.
 
19 Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya;
gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.
20 Napụta ndụ m site na mma agha,
site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.
21 Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a,
zọpụta m site na mpi atụ ndị a.
 
22 Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m;
nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.
23 Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya;
unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya!
Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!
24 Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya
maọbụ kwaa ya emo;
o lefughị ya anya
kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.
 
25 Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị;
aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.
26 Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha,
ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya
ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
 
27 Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta,
ma laghachikwute Onyenwe anyị.
Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche
ga-akpọ isiala nʼihu ya.
28 Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị,
ọ na-achịkwa mba niile.
 
29 Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya;
ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya;
ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.
30 Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi;
a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.
31 Ha ga-ekwusa ezi omume ya
nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị
nʼihi na o meela ya.
* Abụ Ọma 22:2 22:2 Maọbụ, Nʼabalị, adịghị m emechikwa ọnụ m Abụ Ọma 22:12 22:12 Bashan bụ obodo e ji oke ehi gbara abụba ma dịkwa ike maara. Ọ dị na mpaghara ugwu nʼọwụwa anyanwụ ala Filistia. Dit 3:1; Ems 4:1