Abụ Ọma 24
Abụ Ọma Devid.
Eze onyenwe ebube
Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị;
ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile,
o mekwara ka o guzosie ike.
 
Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị?
Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?
Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha,
onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị,
maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.
 
Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị,
natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.
Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya,
bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb.
Sela
 
Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama,
meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie,
ka eze ebube nwee ike ịbata.
Onye bụ eze ebube* a?
Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike.
Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha.
Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama,
buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie,
ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa.
10 Onye bụ eze ebube a?
Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ọ bụ ya bụ Eze ebube!
Sela
* Abụ Ọma 24:8 24:8 Mkp 19:11-16