Abụ Ọma 26
Abụ Ọma Devid.
Ekpere nke ezi mmadụ
Onyenwe anyị, biko kpepụta m,
nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;*
atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi,
na-eleghị anya nʼazụ.
Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m,
nyochaa obi m na echiche m.
Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m.
Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.
 
Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla.
Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.
Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị.
Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.
Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ,
na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.
Ana m abụkwa abụ ekele,
jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.
 
O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya,
ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.
Ebibikọtala mụ na ndị mmehie,
ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,
10 ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ,
aka nri ha jupụtakwara na ngarị.
11 Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke;
gbapụta m ma meere m ebere.
 
12 Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị;
aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.
* Abụ Ọma 26:1 26:1 2Ez 20:2; Ilu 20:7 Abụ Ọma 26:6 26:6 Ọ bụrụ na mmadụ asacha maọbụ kwọọ aka ya nʼihu ọha, ọ na-apụta ngọpụ site nʼihe na-ezighị ezi, maọbụ onye dị otu a na-asị, ikpe amaghị m. Abụ 73:13