Abụ Ọma 30
Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ.
Abụ mgbapụta
Aga m eto gị, O Onyenwe anyị,
nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m.
I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.
O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka,
ị gwọkwara m.
O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m,
i mere ka m dịrị ndụ.
 
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya,
toonu aha nsọ ya.
Iwe ya adịghị adịgide tee anya,
ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi!
Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile,
ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.
 
Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m,
“Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.”
O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma,
i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu;
ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ,
adara m mba.
 
Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru;
ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị,
“Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi?
Uru gịnị dị ma m rịda nʼili?
Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto?
Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?”
10 O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere;
O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka.
 
11 I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu;
ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.
12 I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ.
O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.