Abụ Ọma 36
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị.
Ajọ omume mmadụ na ịdị mma Chineke
E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke
banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe:*
Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke
dị nʼanya ha.
 
Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha,
na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.
Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ;
ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma.
Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe;
ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume,
ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.
 
O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe,
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe.
Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu,
ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri.
O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.
Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke!
Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.
Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị;
Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.
Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị;
ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.
 
10 Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị,
ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.
11 Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi,
ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.
12 Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala,
a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.
* Abụ Ọma 36:1 36:1 Maọbụ, Ozi si nʼaka Chineke: Mmebi iwu nke ndị ajọ omume bi nʼime obi ha.