Abụ Ọma 45
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Okoko osisi lili.” Abụ maskil ụmụ Kora. Abụ maka agbamakwụkwọ.
Abụ ọlụlụ nwunye eze
Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m,
mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze;
ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ.
 
I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ,
e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ,
ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi.
 
Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike;
yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe.
Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri,
nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume;
ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.
Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze;
ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị.
O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ
Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị;
ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị,
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.
Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* máá na aloos na akashia;
ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma.
Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.
Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;
nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.
 
10 Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu:
“Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.
11 Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike.
Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.”
12 Ada Taịa ga-eji onyinye bịa;
ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma.
13 Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya;
ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya.
14 Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị;
ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi
mgbe e dubatara ya nʼụlọeze.
15 E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha;
ha bara nʼime ụlọeze.
 
16 Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị;
ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile.
 
17 Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile;
nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.
* Abụ Ọma 45:8 45:8 Nke a bụ mmanụ isi ọma a na-efesa nʼuwe. Ọ nọ nʼọnọdụ ihe anyị na-akpọ senti taa. Abk 1:12-13. Abụ Ọma 45:12 45:12 Eze mbụ kwụnyeere ọchịchị alaeze Devid bụ eze obodo Taịa, nʼihi Solomọn na eze Taịa nweere ezigbo mmekọrịta dị mma. Taịa bụ isi obodo ebe niile a na-azụ ahịa nʼakụkụ osimiri Mediterenịan.