Abụ Ọma 49
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma.
Nzuzu ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba
Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile!
Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa,
ma ndị dị ala ma ndị dị elu,*
ma onye ọgaranya ma onye ogbenye.
Aga m ekwu okwu amamihe,
ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta.
Aga m aṅa ntị nye ilu,
aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m.
 
Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara,
mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu,
ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha
ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha.
O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ,
maọbụ nye Chineke ụgwọ e ji agbara onye ahụ,
nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ,
o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu,
nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi,
ma hapụ ịnwụ.
10 Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ,
ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa,
si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha.
11 Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi,
ebe obibi ha ruo ọgbọ niile
nʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha.
 
12 Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ,
dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa.
 
13 Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha,
na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha.
Sela
14 Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha,
ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ,
ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ.
Ozu ha ga-erekasị nʼime ili
nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha.
15 Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili,
nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya.
Sela
16 Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba,
mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba,
17 nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ,
ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili.
18 Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ,
ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu,
19 ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya
ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ.
 
20 Ndị bara ụba nke na-enweghị nghọta
dịka anụ ọhịa nke ga-ala nʼiyi.
* Abụ Ọma 49:2 49:2 E nwekwara ike gụọ ya otu a, ma ụmụ mmadụ ma ụmụ nwoke. Abụ Ọma 49:8 49:8 Mat 16:26 Abụ Ọma 49:15 49:15 Hos 13:4; Mak 16:6-7