Abụ Ọma 5
Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ opi ka e ji abụ ya. Abụ Ọma nke Devid.
Ekpere ụtụtụ
Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m
tulee ịsụ ude m.
Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m,
gị Chineke onye bụ eze m.
Nʼihi na ọ bụ naanị gị ka m na-akpọku.
 
Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m;
aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa.
Aga m elekwa anya ọsịsa gị.
Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ;
gị na ndị ajọ omume apụghị ibikọta.
Ndị mpako agaghị eguzo
nʼihu gị.
Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.
Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi;
Onyenwe anyị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile
na ndị aghụghọ niile asị.
Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị,
site nʼoke ịhụnanya gị;
aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala
nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị.
 
Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị
nʼihi ndị iro m;
mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi,
a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi.
Akpịrị ha bụ ili ghere oghe;
ha ji ire ha ekwu okwu ụgha.
10 Maa ha ikpe, Chineke.
Mee ka nzube ọjọọ ha niile bụrụ ọdịda ha.
Chụpụ ha nʼihi ịba ụba nke ọtụtụ mmehie ha,
nʼihi na ha enupula isi megide gị.
11 Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa;
mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ.
Were aka nchebe gị kpuchie ha,
ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.
 
12 Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume.
Ị na-eji ihuọma gị gbaa ha gburugburu dịka ọta.