Abụ Ọma 51
Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko.
Ekpere maka mgbaghara mmehie
O Chineke, meere m ebere,
nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide;
nʼihi oke ọmịiko gị,
hichapụ njehie m niile.
Sachapụ mmehie m niile,*
ma mee m ka m dị ọcha.
 
Nʼihi na amaara m njehie m niile,
mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide,
mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị,
nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu,
na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.
Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m;
bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.
Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo;
ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.
 
Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha;
sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ;
ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.
Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị,
hichapụkwa mmehie m niile.
 
10 Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,
nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
11 Achụpụla m nʼihu gị,
anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
12 Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị,
ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
 
13 Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị,
ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.
14 O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara,
Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m,
ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.
15 O, Onyenwe m, meghee ọnụ m,
ka m kwupụta otuto gị.
16 Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya.
Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.
17 Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa,
O Chineke, ị naghị elefu anya,
nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
 
18 Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu;
i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.
19 Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja,
aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ;
mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.
* Abụ Ọma 51:2 51:2 Aịz 43:25; Aịz 44:22; Kọl 2:14. Abụ Ọma 51:7 51:7 Nʼoge mmemme idebe ihe ọcha, ọ bụ ahịhịa hisọp ka a na-eji efesa ọbara.