Abụ Ọma 55
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid.
Ekpere nke onye enyi ya ghọrọ ya aghụghọ
O Chineke, nụrụ ekpere m,
agbakwala arịrịọ m nkịtị;
ṅaa m ntị, zaakwa m.
Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude
nʼihi ihe onye iro m na-ekwu,
nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ,
nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ,
na-akpagbu m nʼiwe ha.
 
Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m;
oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m.
Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m;
oke egwu ekpuchiela m.
Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru!
Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.
Agaara m efelaga ebe dị anya,
ga nọrọ nʼọzara;
Sela
Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m,
ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.”
 
O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu,
nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo.
10 Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya;
iro na mmegbu dị nʼime ya.
11 A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo;
ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo.
 
12 A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị,
apụrụ m ịnagide ya;
a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m,
apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ.
13 Maọbụ gị, nwoke dịka m,
onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma,
14 onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ,
nʼụlọ Chineke,
ka anyị na-ejegharị
nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.
 
15 Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede;
ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ,
nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha.
 
16 Ma akpọkuru m Chineke,
Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m.
17 Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị,
ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya
ma ọ na-anụkwa olu m.
18 Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ,
site nʼagha niile e busoro m,
nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m.
19 Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi,
onye na-adịghị agbanwe,
ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ,
nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke.
Sela
 
20 Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya,
ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ.
21 Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ* ka bọta,
ma ibu agha juru ya obi;
okwu ya niile dị nro karịa mmanụ,
ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha.
 
22 Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,
ọ ga-agba gị ume;
ọ gaghị ekwe
ka ewezuga onye ezi omume.
23 Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume
nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure;
ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ
agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha.
 
Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.
* Abụ Ọma 55:21 55:21 Ya bụ, okwu ire ụtọ