Abụ Ọma 61
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ.
Ekpere nke onye nọ na nsogbu
Nụrụ akwa m, O Chineke,
gee ntị nʼekpere m.
 
Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa,
ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba;
duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.
Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m,
na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.*
 
Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi,
ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ.
Sela
Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere;
i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.
 
Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze,
mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.
Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;
zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.
 
Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi.
Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.
* Abụ Ọma 61:3 61:3 Ilu 18:10