Abụ Ọma 80
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf.
Ekpere maka nnapụta
Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel,
gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ.
Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim,
nwupụta Ìhè nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase.*
Kpọtee ịdị ike gị,
bịa zọpụta anyị.
 
O Chineke, kpọghachi anyị azụ,
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
 
O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile
ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ
megide ekpere ndị gị?
I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri;
i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ.
I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị,
ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị.
 
O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ,
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
 
I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị;
ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya.
Ị sụchaara ya ala,
mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.
10 Ndo ya kpuchiri ugwu niile,
alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida.
11 Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri
wasaakwa ume ya ruo osimiri.
 
12 Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile
si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya?
13 Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya,
ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.
14 Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.
Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ!
Letakwa osisi vaịnị a,
15 mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ,
ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.
 
16 E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya;
mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi.
17 Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị,
nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.
18 Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ;
tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.
 
19 Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike zọpụta anyị.
* Abụ Ọma 80:2 80:2 Ebo atọ ndị a bụ ụmụ ụmụ Rechel, bụ ndị soo igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼazụ mgbe ndị Izrel na-ala nʼala nkwa ahụ. Abụ Ọma 80:11 80:11 Eleghị anya osimiri ndị a bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis. Nʼoge ọchịchị eze Devid na Solomọn, alaeze ha kwụsịrị nʼosimiri abụọ ndị a.