Abụ Ọma 85
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora.
Ekpere maka ihuọma
O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma;
i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.
I gbagharala ajọ omume ndị gị,
kpuchikwaa mmehie ha niile.
Sela
Ị kwụsịla iwe oke iwe gị,
I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.
 
Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,
wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.
Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe:
Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?
Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ
ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?
O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide,
nyekwa anyị nzọpụta gị.
 
Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu;
ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo,
ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.
Nʼezie, nzọpụta ya dị nso* ndị na-atụ egwu ya,
ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.
 
10 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala;
ezi omume na udo esutula ọnụ.
11 Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta,
ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.
12 Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma,
ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.
13 Ezi omume ga-aga nʼihu ya,
idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.
* Abụ Ọma 85:9 85:9 Aịz 46:13