3
Ụmụ ndị ikom Devid
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Devid, ndị amụụrụ ya mgbe ọ nọ na Hebrọn.
 
Ọkpara ya bụ Amnọn, nke Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ.
Nwa ya nke abụọ bụ Daniel, onye nne ya bụ Abigel onye Kamel.
Nke atọ bụ Absalọm, nwa Maaka, nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua.
Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit
Nke ise bụ Shefataya, nwa Abital.
Nke isii bụ Itream, nke nwunye ya bụ Egla mụrụ.
 
Ụmụ ndị ikom isii ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn, ebe ọ nọ chịa dịka eze afọ asaa na ọnwa isii.
 
 
Devid chịrị na Jerusalem iri afọ atọ na atọ. Ndị a bụkwa ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ:
 
Shamua,* Shobab, Netan na Solomọn. Mmadụ anọ ndị a bụ ndị Batsheba nwa nwanyị Amiel mụrụ.
Ndị ọzọ bụkwa Ibha, Elishua, Elifelet, Noga, Nefeg, Jafia, Elishama, Eliada na Elifelet. Ha niile dị itoolu nʼọnụọgụgụ.
 
Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Devid, na-agụnyeghị ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara. Tama bụ nwanne ha nwanyị.
Ndị eze Juda
10 Ndị a bụ ụmụ Solomọn: Rehoboam,
na Abija,
na Asa,
na Jehoshafat,
11 na Joram,
na Ahazaya,
na Joash,
12 na Amazaya,
na Azaraya,
na Jotam,
13 na Ehaz,
na Hezekaya,
na Manase,
14 na Amọn,
na Josaya.
15 Ụmụ ndị ikom Josaya:
Johanan nwa mbụ ya,
na Jehoiakim nwa ya nke abụọ,
na Zedekaya nwa ya nke atọ,
na Shalum nwa ya nke anọ.
16 Ụmụ Jehoiakim bụ ndị a,
Jehoiakin nwa ya,
na Zedekaya.
Ụmụ ụmụ Jehoiakin
17 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Jehoiakin, eze ahụ a dọtara nʼagha:
Shealtiel, nwa ya, 18 Malkiram, Pedaya, Shenaza, Jekamaya, Hoshama na Nedabaya.
19 Ụmụ ndị ikom Pedaya bụ
Zerubabel na Shimei.
Ụmụ ndị ikom Zerubabel bụ ndị a:
Meshulam na Hananaya. Shelomit bụ nwanne ha nwanyị. 20 E nwekwara ndị ikom ise ọzọ aha ha bụ Hashuba, Ohel, Berekaya, Hasadaya na Jushab-Hesed.
21 Ụmụ Hananaya mụrụ bụ
Pelataya na Jeshaya. Jeshaya mụrụ Refaya; Refaya mụrụ Anan na Ọbadaya, Ọbadaya mụrụ Shekanaya.
22 Ụmụ Shekanaya bụ ndị a:
Shemaya na ụmụ ya ndị ikom: Hatush, Igal, Bariya, Nearaya na Shafat. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ.
23 Ụmụ Nearaya bụ ndị a,
Elioenai, Hezekaya na Azrikam. Ha dị atọ nʼọnụọgụgụ.
24 Ndị Elioenai mụrụ bụ ndị a:
Hodavaya, Eliashib, Pelaya, Akub, Johanan, Delaya na Ananị. Ha niile dị asaa nʼọnụọgụgụ.
* 3:5 3:5 Shimea bụ ụzọ ọzọ e si akpọ Shamua 3:6 3:6 Elishua ma ọ bụkwanụ Elishama. 3:11 3:11 Joram ma ọ bụkwanụ Jehoram