14
Ndị dị ike na ndị dara mba
Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma ọ bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi. Otu onye nwere okwukwe iri ihe niile, ma onye na-adịghị ike nʼokwukwe, na-eri naanị ahịhịa nri. Onye ahụ na-eri ihe niile e kwesighị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ nke nʼadịghị eri ihe niile ekwesighị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nʼihi na Chineke anabatala onye ahụ. Onye ka ị bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye ọ dịrị ikpebi ma odibo ya ọ na-emezi emezi ma ọ dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike.
Otu onye nwere ike na-eche na otu ụbọchị kacha ndị ọzọ na ịdị nsọ, onye nke ọzọ nwekwara ike na-eche na ụbọchị niile bụ otu ihe, ma o kwesiri ka onye ọbụla kpebiere onwe ya. Onye ọbụla na-eche nʼotu ụbọchị bụ nke pụrụ iche, na-eme nke a nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla na-eri otu ihe na-eri ya nʼihi Onyenwe anyị. Ma onye na-adịghị eri otu ihe ahụ na-eme kwa nke a nye Onyenwe anyị. Ma na-enyekwa Chineke ekele. Nʼihi na o nweghị onye nʼime anyị na-adịrị naanị onwe ya ndụ, o nwekwaghị onye nʼime anyị na-anwụrụ naanị onwe ya ọnwụ. Ọ bụrụ na anyị adịrị ndụ, anyị dị ndụ nye Onyenwe anyị; ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị nwụrụ nye Onyenwe anyị; ya mere ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Onyenwe anyị. Ọ bụ nʼihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, ma biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ.
10 Ma gị onwe gị, gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe? Gịnị mekwara i ji eleda ya anya? Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼotu nʼotu nʼihu oche ikpe Chineke. 11 E dere ya,
“ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru,
‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m;
ire* niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ”
12 E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke.
A kwadala nwa nna gị
13 Ya mere, ka anyị kwụsị ikperịta onwe anyị ikpe, kama kpebie nʼime obi gị na i gaghị edochiri nwanna gị ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ maọbụ ihe mgbochi nʼụzọ. 14 Dịka onye nọ nʼime Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya nke ọma na o nweghị ihe ọbụla na-adịghị ọcha na nke onwe ya. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-ahụta ihe ọbụla dịka ihe na-adịghị ọcha, nye onye dị otu a, ihe ahụ adịghị ọcha. 15 Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nʼanya. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe ga-ewetara nwanna gị ịla nʼiyi, nʼihi na cheta na ọ bụkwa nʼihi ya ka Kraịst jiri bịa nwụọ. 16 Ekwela ka ihe ọma gị bụrụ nke a ga-akpọ ajọọ ihe. 17 Nʼihi na alaeze Chineke abụghị oriri na ọṅụṅụ kama ọ bụ ezi omume, na udo na ọṅụ nʼime Mmụọ Nsọ. 18 Nʼihi na onye ọbụla na-efe Kraịst nʼụzọ dị otu a, na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ụmụ mmadụ na-anabatakwa ya.
19 Ka ihe na-agụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe ga-eweta udo, ya na ime ihe nʼụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu. 20 Emebikwala ọrụ Chineke nʼihi nri; nri niile dị ọcha, ma o kwesighị ka onye ọbụla rie ihe ga-eme ka onye ọzọ sụọ ngọngọ. 21 Ọ ga-akara gị mma ka ị hapụ iri anụ maọbụ ịṅụ mmanya ma ọ bụkwanụ ime ihe ọbụla ga-eme ka nwanna gị sụọ ngọngọ.
22 Ya mere, ka okwukwe i nwere banyere ihe ndị a bụrụ nke dị nʼetiti gị na Chineke. Ngọzị na-adịrị onye ọbụla nke na-adịghị ama onwe ya ikpe site nʼihe ọ nabatara. 23 Ma onye ọbụla na-eri ihe ọbụla site nʼobi abụọ bụ onye ikpe mara, nʼihi na ọ jighị okwukwe rie ya, nʼihi na ihe ọbụla a na-esiteghị nʼokwukwe mee bụ mmehie.
* 14:11 14:11 Maọbụ, ọnụ 14:11 14:11 Aịz 45:23