15
Ndị mmụọ ozi asaa ji ihe ntaramahụhụ asaa
Ahụkwara m ihe ịrịbama ọzọ nʼeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ndị mmụọ ozi asaa ji ụzọ ahụhụ asaa. Ha bụ ahụhụ nke ikpeazụ ndị ga-eweta iwe Chineke na ngwụcha.
Abụ ndị a gbapụtara bụrụ
Ahụrụ m ihe dịka oke osimiri enyo a gwakọtara ya na ọkụ, na ndị ahụ nweterala mmeri nʼebe anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya, na ọnụọgụgụ aha ya. Ha guzo nʼakụkụ oke osimiri enyo ahụ, jidekwa ụbọ akwara nke Chineke nʼaka ha. Ha na-abụ abụ Mosis ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ.
“Ọrụ gị niile dị ukwuu dịkwa ebube,
Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ụzọ gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu,
Gị, Eze nke mba niile.
Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị,
onye ga-agharakwa ito aha gị?
Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ.
Mba niile ga-abịakwa
ịkpọ isiala nʼihu gị,
nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.”
Mgbe nke a gasịrị, elere m anya hụ, na e meghere, ụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe, ya bụ, ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji ihe ntaramahụhụ asaa sị nʼụlọnsọ ahụ pụta. Ha yi uwe ogho ọcha, akwa ọcha na-enwu ezigbo ọcha. E kekwasịrị ihe okike ọlaedo gburugburu obi ha. Otu nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi. Mgbe ahụ ụlọnsọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ si nʼebube na ike Chineke na-apụta. O nweghị onye ọbụla nwere ike ịba nʼụlọnsọ ahụ tutu ruo mgbe ntaramahụhụ asaa nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ gwụchara.