18
Nkwatu obodo Babilọn
Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa. O ji olu dị ike tie mkpu,
“ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’*
Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ
nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha,
nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ
nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ.
Nʼihi na mba niile aṅụọla
site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.
Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko,
ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”
Ịdọ aka na ntị
Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị,
“ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’
ka unu ghara iketa oke na mmehie ya,
ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.
Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe.
Chineke echetakwala ajọ omume ya niile.
Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu.
Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere.
Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ.
Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu
dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya.
Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị,
‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m.
Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ,
iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’
Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị,
ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ.
A ga-eji ọkụ rechapụ ya,
nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike.
Ahụhụ atọ bịakwasịrị obodo Babilọn
“Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya. 10 Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị,
“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya
gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara.
Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’
11 “Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ. 12 Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl. 13 Ha na ụda sinamọn na mmanụ otite nke ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, máá na frankisens, mmanya na mmanụ oliv, ụtụ ọka na wiiti, ehi na atụrụ, ịnyịnya na ụgbọala agha, na ndị na-ere mmadụ ibe ha dịka ohu, na ahụ mmadụ na mkpụrụobi mmadụ.
14 “Ha ga-asị, ‘Mkpụrụ ndị ahụ niile nke na-agụ mkpụrụobi agụ e sitela nʼebe ị nọ gabiga. Ihe ọma niile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụahịa niile i ji azụ afọ gị, efunarịla gị. Apụghị ịchọtakwa ha ọzọ mgbe ọbụla.’ 15 Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike.
16 “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ,
nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara
nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche.
17 Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’
“Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya, 18 na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’ 19 Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị,
“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya
ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri
ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya.
Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’
 
20 “Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya,
unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ,
unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ.
Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe
nʼihi mmeso ya megide unu.”
Ụbọchị mkpebi ikpe Babilọn
21 Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị,
“Otu a ka a ga-esi tufuo
Babilọn obodo ukwu ahụ,
agaghị ahụkwa ya ọzọ.
22 Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ.
Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ.
Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla
nʼime gị ọzọ.
Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri
nʼime gị ọzọ.
23 Ìhè nke sitere nʼoriọna
agaghị acha nʼime gị ọzọ.
Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị
na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa.
Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa,
ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa.
24 Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile,
na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”
* 18:2 18:2 Aịz 21:9 18:4 18:4 Jer 51:45 18:7 18:7 Aịz 47:7,8