7
Ndị ozi Chineke a kara akara
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi. Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri, na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.” Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.
 
Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
E sitere nʼebo Manase* họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Oke igwe ndị yi uwe ọcha
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha. 10 Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị,
“Nzọpụta dịrị Chineke anyị,
onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ,
dịkwara Nwa atụrụ ahụ.”
11 Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe, 12 na-asị,
“Amen!
Ngọzị niile na otuto niile,
na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile
na ike niile na ume niile,
dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.
Amen.”
13 Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?”
14 Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.”
Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ. 15 Ọ bụ nke a mere,
“ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke
na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya.
Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ
ga-ekpuchikwa ha.
16 ‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ.
Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla.
Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’
okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ.
17 Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ
ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha;
‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’
‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’§
* 7:6 7:6 Nʼebe a Manase nwa Josef, weere ọnọdụ Dan. 7:16 7:16 Aịz 49:10 7:17 7:17 Aịz 49:10 § 7:17 7:17 Aịz 25:8