2
Ekpere Hana
Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị:
“Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị;
nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi* m elu.
Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m,
nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị.
 
“O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị;
o nweghị onye dị karịa gị,
o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.
 
“Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako,
ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile,
ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.
 
“Ụta ndị na-ebu agha agbajiela
ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike.
Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri,
ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa.
Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa
ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa.
 
Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ,
ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.
Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba;
ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu.
Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye
na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ.
Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ,
na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ.
 
“Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị
nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.
Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya
ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị.
 
“Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa.
10 Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa.
Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha.
Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe.
 
“Ọ ga-enye eze ya ike
bulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.”
11 Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka.
Ụmụ ọjọọ Elayị
12 Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya. 13 Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya. 14 Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo. 15 Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja, ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, “Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ọ ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na ọ chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka ọ chọrọ.”
16 Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.”
17 Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya.
18 Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja. 19 Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja. 20 Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka Onyenwe anyị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri Onyenwe anyị. 21  Onyenwe anyị gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu Onyenwe anyị.
22 Nʼoge a, Elayị abụrụla nnọọ agadi. Ọ nọkwa na-anụ ihe ọjọọ niile ụmụ ya ndị ikom na-eme ndị Izrel niile, ya na otu ha si edinakwuru ụmụ nwanyị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ebe ịchụ aja ụlọ nzute. 23 Ya mere, Elayị gwara ụmụ ya sị, “Anụla m site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị, banyere ihe ọjọọ niile dị iche iche unu na-eme. Gịnị mere unu ji na-eme ihe ọjọọ dị otu a? 24 Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị banyere unu. 25 Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide Onyenwe anyị, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ịla ha nʼiyi.
26 Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị Onyenwe anyị na mmadụ mma.
Amụma megide ezinaụlọ Elayị
27 Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero? 28 Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ. 29 Gịnị mere unu ji na-elelị aja a na-achụrụ m, na onyinye a na-ewetara m nʼusoro dịka m si nye ya nʼiwu anya? Gịnị mere i ji na-asọpụrụ ụmụ gị karịa m, ime onwe unu ka unu gbaa abụba site nʼidebere onwe unu akụkụ kachasị mma nke onyinye niile ụmụ Izrel, ndị m, na-ewetara m.
30 “Nʼihi ya, otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwupụtara, sị, ‘Ekwere m nkwa na ndị ezinaụlọ gị na nke nna gị ga-eje ozi nʼihu m ruo mgbe ebighị ebi,’ ma ugbu a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, ‘Ọ gaghị adịkwa otu a nʼebe m nọ! Nʼihi na ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ, ma ndị niile na-eleda m anya, ka a ga-akpọ ihe efu. 31 Oge na-abịa mgbe m ga-ebipụ ike gị na ike ezinaụlọ nna gị, wezuga ha ka nwoke ọbụla nʼezinaụlọ gị hapụ ito ghọọ agadi. 32 Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị. 33 Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi.
34 “ ‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị. 35 Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile. 36 Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.” ’ ”
* 2:1 2:1 Nʼebe a, mpi na-akọwa maka ike 2:10 2:10 Maọbụ, mpi 2:15 2:15 Nʼiwu e nyere banyere ịchụ aja, abụba na anụ niile abụba kpuchiri ka a na-akpọ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Lev 3:3-5,16; 4:8-10