14
Absalọm alọghachi Jerusalem
Joab, nwa Zeruaya matara na obi eze dị nʼebe Absalọm nọ. Joab zigara ozi na Tekoa, si nʼebe ahụ kpọta otu nwanyị maara ihe. Mgbe nwanyị ahụ bịaruru, Joab gwara ya sị, “Mee onwe gị dịka onye na-eru ụjụ. Yiri akwa mkpe, etekwala mmanụ otite. Kpaa agwa dịka nwanyị nọ nʼiru ụjụ ogologo oge. Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya.
Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!”
Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?”
Ọ zara sị, “Abụ m nwanyị isi mkpe, di m anwụọla. Enwere m ụmụ ndị ikom abụọ ndị gara lụọ ọgụ nʼọhịa. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ, o nweghị onye pụtara gboo ha. Nʼihi ya, otu nʼime ha tigburu ibe ya. Ma ugbu a, ndị ikwu di m na-esogbu m na-asị ‘Kpọpụta onye ahụ gburu nwanne ya ka anyị gbuo ya nʼihi ndụ nwanne ya o wepụrụ, ka anyị si otu a memilaa onye nke fọdụrụ ga-erita oke ezinaụlọ.’ Ha chọrọ isi otu a menyụọ icheku ọkụ nke fọdụụrụ m, nke bụ na di m agaghị enwezikwa aha maọbụ onye fọdụụrụ ya nʼelu ụwa.”
Eze sịrị nwanyị ahụ, “Laa nʼụlọ gị, aga m ahụ na o nweghị onye metụrụ ya aka.”
Ma nwanyị ahụ si Tekoa sịrị ya, “Ka onyenwe m, bụ eze, gbaghara mụ na ezinaụlọ m, ka ikpe ọmụma ọbụla ghara ịdịrị eze na ocheeze ya.”
10 Eze zara ya, “Enyela onwe gị nsogbu maka nke ahụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla agwa gị okwu ọbụla, kpọtara m ya. Onye dị otu a agaghị enyekwa gị nsogbu ọzọ.”
11 Mgbe ahụ ọ zara, “Biko, ka eze kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya ka ọ kwụsị onye na-agwa ọchụ, ka ọ ghara igbu onye ọzọ, ka a gharakwa ịla nwa m nwoke nʼiyi.”
Ọ sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,* otu agịrị isi agaghị esi nʼisi nwa gị dapụ nʼala.”
12 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ sịrị, “Biko kwere ka ohu gị nwanyị gwa onyenwe m eze otu mkpụrụ okwu ọzọ.”
Ọ sịrị, “Gaa nʼihu kwuo.”
13 Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ nʼihi gịnị ka ị chere ihe dị otu a megide ndị nke Chineke? Mgbe eze na-ekwu otu a, ọ bụ na ọ dịghị ama onwe ya ikpe, nʼihi na eze a jụla ịkpọghachi nwa ya a chụpụrụ achụpụ? 14 Anyị niile ga-anwụ. Anyị dịkwa ka mmiri a wụsara nʼala, nke a na-apụghị ịchịkọtakwa ọzọ. Ma Chineke adịghị anapụ mmadụ ndụ ya, ma ọ na-emeghepụ ụzọ ga-eme ka onye ọ chụpụrụ achụpụ lọghachikwutekwa ya.
15 “Ma ugbu a, ebe m bịara ịgwa onyenwe m bụ eze, okwu a, nʼihi na ndị mmadụ emenyela m egwu. Ohu gị chere nʼobi ya, ‘Aga m agwa eze okwu; ma eleghị anya, ọ ga-emezuru ohu ya nwanyị ihe ọ rịọrọ. 16 Ma eleghị anya eze ga-anapụta ohu ya nwanyị site nʼaka nwoke ahụ na-agbalị ibipụ mụ na nwa m nwoke site nʼihe nketa nke Chineke.’
17 “Ugbu a, ohu gị nwanyị na-asị, ‘Ka okwu onyenwe m eze kwuru wetara m izuike, nʼihi onyenwe m eze na-enyochapụta ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ dịka mmụọ ozi Chineke. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị.’ ”
18 Mgbe ahụ, eze gwara nwanyị ahụ okwu sị, “Achọrọ m ka ị gwa m eziokwu nʼajụjụ a m na-aga ịjụ gị.”
Nwanyị ahụ zara sị, “Ka onyenwe m, bụ eze kwuo ihe dị ya nʼobi.”
19 Devid jụrụ ya sị, “Aka Joab ọ dị nʼokwu ndị a niile?”
Nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ị na-adị ndụ, onyenwe m, bụ eze, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi nʼihe onyenwe m bụ eze kwuru, chee ihu nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. E, ọ bụ ohu gị Joab nyere m iwu ime nke a, ya gwakwara ohu gị nwanyị okwu niile ndị a. 20 Ohu gị bụ Joab mere ihe a ka ọ gbanwee otu ọnọdụ ihe dị ugbu a. Onyenwe m nwere amamihe dịka ndị mmụọ ozi Chineke. Ọ maakwara ihe niile na-eme nʼala.”
21 Eze sịrị Joab, “Ọ dị mma, aga m eme ya. Gaa kpọghachite nwokorobịa ahụ bụ Absalọm.”
22 Joab dara nʼala kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala, gọzie eze. Joab sịrị, “Taa ka ohu gị maara na ahụtala m amara nʼihu gị, onyenwe m bụ eze, nʼihi na eze e merela ohu ya ihe ọ rịọrọ.”
23 Joab biliri gaa Geshua, kpọlata Absalọm na Jerusalem. 24 Mgbe ha bịaruru, eze gwara Joab okwu sị, “Gwa ya ka ọ laa nʼụlọ ya. Ọ gaghị abịa nʼihu m, nʼihi na-achọghị m ịhụ ya anya.” Ya mere, Absalọm lara nʼụlọ ya. Ọ hụkwaghị eze anya.
25 Ọ dịghị nwoke mara mma dịka Absalọm nʼala Izrel niile. Ọ dịkwaghị onye na-adịghị ekwu okwu banyere ịma mma ya. Nʼihi na ntụpọ ọbụla adịghị ya nʼahụ site nʼopi isi ya ruo nʼọbọ ụkwụ ya. 26 Mgbe ọbụla ọ kpụchara ntutu isi ya, nʼihi na ọ bụ otu ugboro nʼafọ ka ọ na-akpụcha agịrị isi mgbe o bidoro ịnyị ya arọ. Ọ na-atụ agịrị isi a na-akpụchapụta ya nʼisi, ịdị arọ ya na-eru narị shekel abụọ ma a tụọ ya nʼihe ọtụtụ eze.
27 Absalọm mụtara ụmụ ndị ikom atọ, na otu nwanyị, aha ya bụ Tama. Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu.
28 Mgbe Absalọm nọrọ afọ abụọ na Jerusalem na-ahụghị eze anya, 29 o ziri ozi ka Joab bịa, ka ọ gaa ziere ya eze ozi, ma Joab abịaghị. Absalọm zigakwara ozi ọzọ ka ọ bịa ma Joab ekweghị ịbịa. 30 Nʼikpeazụ, Absalọm gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Gaanụ sunye ubi ọka balị Joab dị nʼakụkụ nke m ọkụ.” Ha mekwara dịka a gwara ha.
31 Mgbe ahụ, Joab biliri jee nʼụlọ Absalọm, ma sị ya, “Gịnị mere ndị na-ejere gị ozi ji gbaa ubi m ọkụ?”
32 Absalọm sịrị ya, “Lee ezitere m gị ozi, sị, ‘Bịa nʼebe a ka m ziga gị na nke eze ka ị jụta, “Nʼihi gịnị ka m ji site na Geshua lọghachita? Ọ gara a kara m mma ma a sị na m nọ nʼebe ahụ ruo ugbu a.” ’ Ugbu a, achọrọ m ka mụ hụ ihu eze, ọ bụrụ na onwe ajọ omume dị nʼime m, ya mee ka m nwụọ.”
33 Joab gakwuru eze, gwa ya ihe Absalọm kwuru. Mgbe ahụ, eze kpọrọ Absalọm, onye batara ma kpọọ isiala nʼihu eze. Eze sutukwara ya ọnụ.
* 14:11 14:11 1Sa 14:45; 1Ez 1:52; Mat 10:30; Ọrụ 27:34 14:26 14:26 Nke a bụ kilo abụọ na ụma atọ