22
Abụ otuto Devid
Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị:
Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.
Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m.
Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m,
site nʼaka ndị na-eme ihe ike.
 
“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.
Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;
Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.*
Ụdọ niile nke ili kere m agbụ,
Ọnya nke ọnwụ guzogidere m.
 
“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,
akpọkuru m Chineke m.
Akwa m ruru ya ntị.
O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,
ntọala eluigwe makwara jijiji,
ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;
Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta.
Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
10 O kewara mbara eluigwe, rịdata;
oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
11 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,
O feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
12 O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
13 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya,
amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ.
14  Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ.
Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
15 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa.
O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
16 E kpughere ala ala nke oke osimiri.
Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ,
site nʼịba mba nke Onyenwe anyị,
na nkuume si nʼimi ya pụta.
 
17 “O sitere nʼelu setịpụ aka ya,
jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
18 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,
bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
19 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m.
Ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
20 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,
Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
 
21 Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị,
Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
22 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị;
ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
23 Iwu ya niile dị nʼihu m,
esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
24 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,
edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
25  Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,
dịka ịdị ọcha m si dị nʼanya ya.
 
26 “Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
27 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
28 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala.
29 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m,
Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
30 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;
sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
 
31 “Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke;
okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha.
Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
32 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?
Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke?
33 Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
34 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele
Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
35 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,
ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
36 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,
inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
37 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ.
Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.
 
38 “Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha.
Alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
39 Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite.
Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ.
40 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha.
I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
41 I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga.
Ebibiekwala m ha niile.
42 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
43 Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala.
Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
 
44 “Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ.
Ị chebere m dịka onyeisi nke ọtụtụ mba.
Ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
45 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,
ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
46 Obi na-ada ha mba.
Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.
 
47 Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m.
Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m.
48 Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ.
Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m.
49 Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.
I mere ka m dị elu karịa ndị iro m.
Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
50 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche.
Aga m abụku aha gị abụ otuto.
 
51 “Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu.
Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere.
Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.”
* 22:5 22:5 Mmekpa ahụ nke na-eweta mbibi bịakwasịrị m