9
Ikpe ọmụma megide ndị iro Izrel
Okwu Amụma.
Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak,
na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike,
nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile
na ebo niile nke Izrel dị.
Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso;
tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.
Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike,
tụkọba ọlaọcha dịka aja,
na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.
Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere
ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri,
ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.
Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.
Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu.
Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla.
A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya.
Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.
Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd,
aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.
Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha,
wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya.
Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị,
ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda.
Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.
Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche,
ka ndị iro ghara ịbata na ya.
Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha,
nʼihi na anọ m na nche ugbu a.
Ọbịbịa nke eze Zayọn
Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn!
Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem!
Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị,
onye ezi omume na onye nwere mmeri,
onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu,
ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.
10 Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem,
na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem;
a ga-agbajikwa ụta agha.
Ọ ga-ewetara mba niile udo,
ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ,
sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa.
11 Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha,
nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara.
12 Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya.
Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ.
13 Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m,
tinye Ifrem dịka àkụ.
Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn,
ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis.
Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.
Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya
14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha,
àkụ ya ga-efekwa dịka amụma.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike,
ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.
15  Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha.
Ha ga-ebibi,
zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile.
Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya;
ha ga-ejupụta dịka efere,
dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.
16 Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya,
dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya.
Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa
e tinyere nʼokpueze si na-egbuke.
17 Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu!
Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma,
mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.