2
E kpere Juda na Jerusalem ikpe ha na mba niile
Oku akpọrọ Juda ka ọ chegharịa
Chịkọtaanụ onwe unu, e, chịkọtaanụ onwe unu,
unu ndị mba ihe ihere dịrị.
Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ,
a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu,
tupu iwe ọkụ Onyenwe anyị
abịakwasị gị,
tupu ụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị
abịakwasị gị.
Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ,
unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu.
Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi,
ma eleghị anya, a ga-echebe unu
nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.
Ahụhụ dịrị Filistia
Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza,
obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu.
Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd;
a ga-ehopukwa Ekrọn.
Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri,
unu bụ ndị Keret;
okwu Onyenwe anyị na-emegide unu,
Kenan, ala ndị Filistia.
Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi,
ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.”
Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ,
ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ
na ọgba igwe ewu na atụrụ.
Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri
ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda,
ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa.
Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu,
dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi.
Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha,
mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile.
Ahụhụ dịrị Moab na Amọn
“Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab,
na ịkwa emo niile nke ndị Amọn,
nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m
na-anya isi na ha ga-ewere ala ha.
Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,”
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
bụ Chineke Izrel, kwubiri ya,
“aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm,
mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra.
Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara,
na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi.
Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha,
ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.”
 
10 Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha,
na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide
ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
11 Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ,
mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi.
Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya,
onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile.
Ahụhụ dịrị Kush
12 “Unu ndị Itiopia,*
a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”
Ahụhụ dịrị Asịrịa
13 Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu,
laa Asịrịa nʼiyi.
Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu,
ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.
14 Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ,
ha na ihe e kere eke dị iche iche.
Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo
ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ.
Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku,
mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile,
ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.
15 Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri,
nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla;
nke na-asị onwe ya,
“Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.”
Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu;
lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi.
Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ,
ma fufekwaa isi ya.
* 2:12 2:12 Maọbụ, Kush