27
Abụ akwa nʼihi Taịa
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere Taịa, sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị,
“Ezuru m oke nʼịma mma.”
I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri.
Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke.
Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị
sitere nʼosisi junipa nke si Senia;
ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn
ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.
Osisi ook nke si Bashan
ka e ji mee ụmara gị niile.
Osisi e si Saiprọs bubata
ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.
Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata,
ka e ji mee ọkọlọtọ gị.
Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo,
nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.
Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị.
Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri.
Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị.
Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ.
Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha
na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị.
 
10 “ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya,* na Put,
jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị.
Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị,
na-ewetara gị ebube.
11 Ndị ikom Avad, na Helek
bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile.
Ndị ikom Gamad
na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike.
Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị,
ime ka ịma mma gị zuo oke.
12 “ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
13 “ ‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
14 “ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ.
15 “ ‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
16 “ ‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
17 “ ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
18 “ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta, 19 na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
20 “ ‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ.
21 “ ‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa.
22 “ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.
23 “ ‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa. 24 Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.
25 “ ‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish
bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị.
I jupụtara nʼihe ahịa,
gị obodo dị nʼetiti mmiri.
26 Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị
na-ebuba gị nʼosimiri.
Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ
ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.
27 Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile,
na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị,
ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile,
ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gị
ka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri,
nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu.
28 Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji
mgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa.
29 Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri,
na ndị ọka ụgbọ niile nke oke osimiri,
ga-esitekwa nʼụgbọ ha
rịdata guzo nʼelu ala.
30 Ha ga-eti mkpu akwa,
ha ga-akwa akwa nke ukwuu,
werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi,
na-atụrụkwa onwe ha na ntụ.
31 Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha,
yirikwa akwa mkpe,
kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha.
Ha ga-etikwa aka ha nʼobi.
32 Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị,
nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị,
“Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa,
nke osimiri gbara gburugburu?”
33 Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị,
e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ.
E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị
mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.
34 Ugbu a, mmiri e riela gị,
ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ.
Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile,
na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.
35 Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri
osimiri niile anya.
Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu;
ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu.
36 Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha,
nʼihi na ihe mere gị dị egwu.
Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”
* 27:10 27:10 Maọbụ, Lud 27:13 27:13 Maọbụ, Javan 27:14 27:14 Nke a bụ nʼọnọdụ ịkwụ ụgwọ, mgbe ụfọdụ ọ bụrụ na mmadụ ejighị ego, o nwere ike jiri ihe o nwere kwụọ ụgwọ ihe ọ zuru, site nʼụzọ ịgbanwere ihe.