28
Amụma megide eze Taịa
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:
“ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi,
ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi,
mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi,
nke dị nʼetiti oke osimiri niile.”
Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,*
ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.
Ị maara ihe karịa Daniel?
Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ?
I werela amamihe gị na nghọta gị
nwetara onwe gị akụ,
tụkọba ọlaedo na ọlaọcha,
nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.
E, mmụta nʼịzụ ahịa gị
emeela ka ị ghọọ ọgaranya,
nʼihi akụnụba inwere
ị bụrụla onye na-akpa nganga.
“ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu;
“ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe
onye maara ihe dịka chi,
ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị,
bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere.
Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị,
ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị.
Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ.
Ị ga-anwụ ọnwụ ike
nʼetiti oke osimiri niile.
Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,”
nʼihu ndị ahụ na-egbu gị?
Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,
nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.
10 Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu,
site nʼaka ndị ọbịa.
Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
 
11 Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 12 “Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke,
ị jupụtara na amamihe na ịma mma.
13 Ị nọ nʼIden,
nʼubi Chineke a gbara ogige.
Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma,
rubi, na topaazi, na emeralụdụ,
na krisolaịt, na ọniks, na jaspa,
na safaia, na tọkwọisi, na beril.
A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo.
Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.
14 Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub,
ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ.
Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ,
na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.
15 Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta
nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị,
tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.
16 Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị
ị ghọrọ onye na-eme ihe ike,
si otu a mehiekwa.
Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị.
Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị,
gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.
17 Obi gị jupụtara na nganga
nʼihi ịma mma gị,
i mere ka amamihe gị
bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị.
Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala,
mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile.
18 Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị,
i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ.
Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta,
repịa gị.
Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala,
nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.
19 Ndị niile maara gị
ka ihe ndị a juru anya,
nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu.
Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”
Amụma megide Saịdọn
20 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21 “Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya, 22 ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn,
nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m.
Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị
mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu,
nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ.
23 Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya,
meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile.
Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya,
site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile.
Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
24 “ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
25 “ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m. 26 Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’ ”
* 28:2 28:2 Maọbụ, Chineke 28:2 28:2 Maọbụ, Chineke 28:13 28:13 Maọbụ, kanelien