10
Izrel bụ osisi vaịnị dị mma,
nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu.
Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba,
otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya.
Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba
otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ.
Obi ha dị aghụghọ,
ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha.
Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha,
ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile.
 
Ma ugbu a, ha ga-asị,
“Anyị enweghị eze,
nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu,
ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?”
Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru,
were ịṅụ iyi
na-agbakwa ndụ,
ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile,
dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi.
Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ
nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven.*
Ndị ya ga-eruru ya ụjụ,
otu a kwa ka ndị nchụaja ya
rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ,
maka ebube nke a napụrụ ya.
Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa,
dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ.
A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu,
Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ.
A ga-ala eze Sameria nʼiyi
dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile,
a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven,
ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel,
ogwu na uke ga-etolitekwa,
nʼebe nchụaja ha.
Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!”
Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!”
 
“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie,
i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị.
Ọ bụ na agha agaghị eri ha
bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?
10 Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ;
mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha,
taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha.
11 Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ
nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya,
nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu
nʼolu ọma ya ahụ.
Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya,
Juda aghaghị ịkọ ala ubi
Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya.
12 Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu,
unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya.
Kọgharịakwanụ obi unu siri ike,
nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị,
tutu ruo mgbe ọ bịara
wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume.
13 Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume;
unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi.
Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha.
Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu,
na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu.
14 Nʼihi ya, ụzụ nke ibu agha aghaghị ibili nʼetiti unu,
ebe unu niile e wusiri ike ga-ada.
Ọ ga-ada dịka Shalman si bibie Bet Abel nʼụbọchị agha,
mgbe a tụpịara ndị bụ nne na ụmụ ha.
15 Ọ bụ ihe dị otu a ga-adakwasị gị, Betel,
nʼihi na ajọ omume gị dị ukwuu.
Mgbe chi ụbọchị ahụ bọrọ,
a ga-ala eze Izrel nʼiyi kpamkpam.
* 10:5 10:5 Bet-Aven pụtara ụlọ ihe ajọ aha ịkwa emo Betel; Betel nke pụtara ụlọ Chineke 10:8 10:8 Aven, na-ekwu banyere Bet-Aven aha ịkwa emo na-akpọ Betel