9
Ntaramahụhụ dịrị Izrel
Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel,
ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ,
nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna
i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya
nʼelu ebe ịzọcha ọka niile.
Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri,
mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha.
Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị,
ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt
nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ.
Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị,
nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ.
Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị.
Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha.
Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha,
ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
 
Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka,
ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị?
A sịkwa na ha agbanarị mbibi,
ndị Ijipt ga-achịkọta ha.
Ndị Memfis ga-elikwa ha.
Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ,
ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile,
Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ* na-abịa,
Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso.
Ka Izrel mara nke a.
Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu,
nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala,
unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu,
na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara.
Ma onye amụma bụ onye nche Chineke,
na-eche Ifrem nche,
ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile,
ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya.
Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu,
dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea.
Ọ ga-echeta njehie ha.
Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile.
 
10 “Mgbe m chọtara Izrel,
ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara;
mgbe m hụrụ nna nna unu ha,
ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig.
Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa,
ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere,
si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ.
11 Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ,
nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime.
12 A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha,
aghaghị m ime ka ha nwụọ.
Ahụhụ ga-adịrị ha,
mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m.
13 Ahụla m na Ifrem yiri Taịa,
bụ ihe akụnyere nʼala mara mma.
Ma Ifrem ga-eji aka ya
kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.”
 
14 Biko, Onyenwe anyị nye ha.
Gịnị ka i kwesiri inye ha?
Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya,
na ara nke mmiri ara na-adịghị.
 
15 “Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal,
akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ.
Nʼihi omume mmehie ha niile,
aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha.
Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ,
ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi.
16 Etigbuola Ifrem,
mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla,
ha agaghị amịkwa mkpụrụ.
A sịkwarị na ha amụọ ụmụ,
aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.”
 
17 Chineke m ga-ajụ ha,
nʼihi na ha adịghị ege ya ntị maọbụ rube isi.
Ha ga-aghọ ndị na-awagharị awagharị na-enweghị ụlọ, nʼetiti mba niile.
 
* 9:7 9:7 Maọbụ, nleta