12
Abụ Otuto
Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,
“Aga m eto gị Onyenwe anyị.
Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,
ma ugbu a, iwe gị adajụọla;
ị kasịkwara m obi.
Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;
aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,
ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri
site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,
“Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya*;
meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ;
kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube.
Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.
Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ.
Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel.§ dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”*
* 12:4 12:4 1Ih 16:8; Abụ 105:1 12:4 12:4 Abụ 145:4-6. 12:6 12:6 Zef 3:14,15 § 12:6 12:6 Abụ 89:18 * 12:6 12:6 Zef 3:17