13
Amụma e buru megide Babilọn
Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.
Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu.
Kpọkuonụ ndị agha.
Feerenụ ha aka,
ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.
Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu;
akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m.
E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m.
 
Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;
gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme.
Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche.
Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe.
Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.
Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya
na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa.
Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị
na-abịa imebi ala ahụ niile.
 
Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,*
ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.
Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,
obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.
Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.
Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha
mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme.
Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme.
Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.
 
Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,
ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma.
A ga-ekpochapụ ala ahụ,
ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya.
10 Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu
agaghị egosipụta ìhè ha.
Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya
ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
11 Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,
taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha.
Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa,
ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.
12 Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa.
13 Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,
meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya,
nʼihi oke iwe ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.
 
14 Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.
Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha
dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta,
maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha.
15 Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,
onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo.
16 A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;
a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha.
 
17 Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;
ọ dịkwaghị ọlaedo
maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya.
18 Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;
ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere,
maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere.
19 Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile,
ịma mma na ebube ndị Kaldịa,
mgbe Chineke ga-akwatu ya
ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.
20 Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya.
Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya;
ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ.
21 Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara.
Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa,
na ikwighịkwighị,
nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị.
22 A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike.
Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ.
Lee na oge ha ji emezu adịla nso,
a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.
 
 
* 13:6 13:6 Izk 30:3; Ems 5:18; Zef 1:7; Mkp 6:17 13:13 13:13 Heg 2:6 13:13 13:13 Abụ 110:5; Akw 1:12