51
Nzọpụta ebighị ebi dịrị Zayọn
Geenụ m ntị, unu ndị niile na-agbaso ezi omume,
ndị na-achọ Onyenwe anyị!
Legidenụ oke nkume ahụ e sitere na ya wapụta unu anya.
E, legidenụ ọgba nkume ahụ e si nʼime ya gwupụta unu anya!
Legidenụ Ebraham bụ nna unu
na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu.
Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya,
ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba.
Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi,
werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ,
ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden,
ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị.
Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya,
inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa.
 
Ndị m, geenụ m ntị;
ṅaa ntị, gị Izrel mba nkem,
nʼihi na iwu m ga-esi nʼọnụ m pụọ;
ikpe ikpe ziri ezi m ga-aghọkwara mba niile ìhè.
Ezi omume m na-abịaru unu nso ọsịịsọ,
nzọpụta m na-adịkwa nso.
Aga m achịkwa mba niile.
Mba dị anya ga na-ele anya ọbịbịa m;
ha ga na-ele anya nzọpụta nke m ga-azọpụta ha.
Welienụ anya unu lee anya nʼelu,
leekwanụ anya nʼụwa,
nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ;
ụwa ga-aka nka dịka akwa,
ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji.
Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ.
 
Geenụ m ntị, unu niile ndị maara ihe ọma,
unu ndị na-anabata iwu m nʼobi unu.
Unu atụla egwu ihe ndị mmadụ ga-asị unu,
unu atụkwala egwu nkwutọ ha ga-ekwutọ unu.
Nʼihi na nla ga-eri ha dịka o si eri akwa.
Ikpuru ga-erichapụ ha dịka o si eri ajị anụ.
Ma ezi omume m, na obi ebere, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Nzọpụta m ga-adịkwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
 
Teta, teta, yikwasị onwe gị ike,
gị aka Onyenwe anyị,
bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga,
dịka ọgbọ nke mgbe ochie.
Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab
ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ?
10 Ọ bụghị gị mere ka osimiri taa?
Mmiri ahụ dị omimi.
Ọ bụghị gị mekwara ka okporoụzọ dịrị nʼetiti ya,
ebe ndị ahụ ị gbapụtara si gafee?
11 Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa.
Ha ga-eji abụ bata na Zayọn;
ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha,
oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha,
iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.
 
12 “Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi.
Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ,
ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa,
13 na ị na-echefu Onyenwe anyị bụ onye kere unu,
onye na-esetipụ eluigwe,
onye tọkwara ntọala niile nke ụwa;
na-ebi ndụ ịtụ oke egwu ụbọchị niile
nʼihi oke iwe nke onye mkpagbu ahụ,
onye nke kpebiri ibibi unu?
Ma olee ebe oke iwe nke onye mkpagbu ahụ dị?
14 Nʼoge na-adịghị anya, a ga-agbapụta ndị mkpọrọ egwu mere ka ha rudata ala.
Ha agaghị anwụ nʼime olulu,
nri agakwaghị akọ ha.
15 Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu,
onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ,
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
16 Etinyela m okwu m nʼọnụ gị,
chebekwa gị nʼọbụaka m.
Ọ bụ m tinyere eluigwe nʼọnọdụ ya,
dokwaa ntọala nke ụwa.
Ọ bụkwa m na-asị Zayọn, ‘Ndị m ka unu bụ.’ ”
Iko ọnụma Onyenwe anyị
17 Teta, teta,
bilie gị Jerusalem,
gị onye ṅụrụ site nʼaka Onyenwe anyị,
bụ iko nke oke iwe ya.
Gị onye ṅụrụ ihe niile dị nʼime iko ahụ
nke na-eme ka ụmụ mmadụ dagbugharịa.
18 Ọ dịghị otu nwa ya nke fọdụrụ,
nke ga-agwa ya ihe ọ ga-eme,
maọbụ nke ga-edu ya nʼụzọ
o kwesiri ịgbaso.
19 Ihe abụọ ndị a adakwasịla gị.
Onye ga-akasị gị obi?
Mbibi na ịla nʼiyi, ụnwụ na mma agha,
onye ga-akasị gị obi?
20 Nʼihi na ụmụ gị ndị ikom adaala mba.
Ha na-atọgbọkwa nʼakụkụ okporoụzọ niile,
dịka mgbada ọnya mara.
Ha bụ ndị jupụtara nʼọnụma Onyenwe anyị
na ịba mba nke Chineke gị.
 
21 Ya mere, nụrụ nke a, unu ndị a na-akpagbu,
ndị ihe na-egbu ma ọ bụghị mmanya.
22 Lee ihe Onyenwe anyị kwuru,
bụ Chineke unu, onye ihe banyere ndị ya na-emetụ nʼobi.
“Lee, aga m esite nʼaka gị
wezuga iko ahụ mere ka ị dagbugharịa,
ị gaghị aṅụkwa
site nʼiko ọnụma ahụ ọzọ.
23 Ma m ga-etinye ya nʼaka ndị ahụ na-akpagbu gị,
bụ ndị sịrị gị,
‘makpuru nʼala ka anyị gaa ije nʼelu ahụ gị.’
I mere azụ gị ka ọ dị ka ala, dịka okporoụzọ
ebe ndị mmadụ si aga ije.”