52
Teta, teta gị Zayọn,
yikwasị onwe gị ike dịka uwe!
Yikwasị onwe gị uwe mara mma,
gị Jerusalem, obodo dị nsọ.
Ndị a na-ebighị ugwu na ndị rụrụ arụ
agaghị abata nʼime gị ọzọ.
Kụchapụ aja dị nʼahụ gị,
bilie ọtọ, gị Jerusalem, nọdụ ala nʼocheeze gị.
Tọpụ onwe gị site nʼagbụ igwe e kere gị nʼolu,
gị ada Zayọn, a dọtara nʼagha.
Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼefu ka erere unu, anaghị ndị zụrụ unu ego ọbụla,
ọ bụghịkwa ego ka a ga-eji gbapụta unu.”
Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“Na mbụ, ọ bụ nʼala Ijipt ka ndị m gara biri,
ugbu a, ọ bụ ndị Asịrịa na-akpagbu ha.
“Ma ugbu a, gịnị ka m nwere nʼebe a?” bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ebe ọ bụ na e durula ndị m pụọ nʼefu,
ndị na-achị ha na-akwakwa ha emo na-achị ha ọchị nlelị,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ha na-ekwulukwa aha m
ogologo ụbọchị niile.
Nʼihi ya, ndị m ga-ama aha m;
nʼihi nke a, ha ga-amarakwa nʼụbọchị ahụ
na ọ bụ Mụ onwe m kwuru na ọ ga-eme.
E, ọ bụ mụ onwe m.”
 
Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwu
bụ ụkwụ ndị na-eweta* oziọma,
onye na-ekwusa okwu udo,
e, onye na-eweta akụkọ ọma,
onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta,
onye na-asị Zayọn,
“Lee, Chineke gị bụ eze!”
Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu,
ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ.
Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn,
ha ga-ahụ ya anya.
Tienụ mkpu ọṅụ
unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem,
nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.
Ọ gbapụtala Jerusalem.
10  Onyenwe anyị ga-eme
ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ;
ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa
nzọpụta Chineke anyị.
 
11 Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ.
Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka.
Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha,
unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị.
12 Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ,
unu agakwaghị agbapụ ọsọ,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ,
ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ.
Ahụhụ na Ebube nke ohu ahụ
13 Lee, ohu m ga-enwe uche,
a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ.
14 Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ;
otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ,
anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ.
15 Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche,
ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya,
ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ,
ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa.
 
* 52:7 52:7 Maọbụ, na-ezisa 52:15 52:15 Maọbụ, otu a ka ọtụtụ mba dị iche iche ga-anọ na mgbagwoju anya.