53
Onye kweere ozi anyị,
ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?
Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome,
dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ.
O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya.
O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike.
Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya.
Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ.
Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ.
E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla.
 
Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru,
burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile,
ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ,
onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ.
Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị:
ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ.
E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ;
ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike.
Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ;
onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya.
Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya
ajọ omume anyị niile.
 
A kpagburu ya, mesie ya ihe ike,
ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta.
E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu,
dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị,
otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya.
Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya.
Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ* ya weliri olu kwuo okwu?
Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ;
maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe.
E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu,
ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya,
ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere,
ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta.
 
10 Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ.
Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie.
Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge.
Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya.
11 Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ,
ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya,
site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume,
ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.
12 Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba,
ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha,
nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ,
a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ,
rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.
* 53:8 53:8 Ya bụ, kwụpụtara 53:8 53:8 Ya bụ, taa ya ahụhụ 53:12 53:12 Maọbụ, ndị dị ike