64
Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala,
ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị!
Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi,
na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ.
Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro* gị niile maara aha gị,
meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.
Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya
ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị.
Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ,
ọ dịbeghị ntị ghọtara,
o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị,
onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.
Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka,
bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha.
Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha,
iwe were gị.
A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?
Anyị niile dịka onye rụrụ arụ,
ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi.
Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi,
mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.
Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ;
ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị.
Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ,
meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị.
 
Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị.
Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite.
Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.
Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe;
echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
Biko, lekwasị anyị anya
nʼihi na ndị gị ka anyị bụ.
10 Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara;
ọ bụladị Zayọn aghọọla ọzara, Jerusalem, ebe tọgbọrọ nʼefu.
11 Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe,
abụrụla ihe a gbara ọkụ.
Ihe niile mara mma nʼime ya alaala nʼiyi.
12 Mgbe ihe niile gasịrị, Onyenwe anyị, ị ga-ejisi onwe gị ike?
Ị ga-agba nkịtị, taa anyị ahụhụ ebe ọ gafere oke?
* 64:2 64:2 Ya bụ, ndị na-emegide gị