65
Ikpe na nzọpụta
“Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.
Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m.
Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m,
asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’
Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ
nye ndị na-enupu isi,
bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi
ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha,
ndị na-anọgide na-akpasu m iwe
nʼihu m mgbe niile,
ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige,
nʼebe ịchụ aja eji brik wuo,
ndị na-anọdụ nʼetiti ili,
ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche;
ndị na-eri anụ ezi,
ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha;
ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso,
nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’
Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m.
Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị.
 
“Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị:
Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju.
E, aga m akwụghachi ha.
Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche,
kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile.
Aga m akwụghachi ha nʼuju,
nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.”
Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị
ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya,
nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’
otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m;
Agaghị m ebibicha ha niile.
Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta,
sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile.
Ndị m họpụtara ga-eketa ha,
ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.
10 Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ;
Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi,
na ndị m na-achọsi m ike.
 
11 “Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ,
ndị chezọrọ ugwu nsọ m,
ndị na-edozi tebul maka Ihuọma,
ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.*
12 Aga m eme ka unu zute mma agha;
unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu.
Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị;
mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị.
Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu,
họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.”
13 Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“Ndị ohu m ga-eriju afọ,
ma unu ga-anọ agụụ,
akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ,
ma ha ga-aṅụ mmiri.
Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere,
ma ha ga-anọ nʼọṅụ.
14 Ndị ohu m ga-abụ abụ
nʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha,
ma unu ga-akwa akwa,
nʼihi ihe mgbu nke obi unu,
tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu.
15 Unu ga-ahapụ aha unu
nye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ;
nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-etigbu unu,
ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ.
16 Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ,
ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu,
onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ
ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu.
Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga,
zokwa ha site nʼanya m.
Ụwa ọhụrụ na eluigwe ọhụrụ
17 “Nʼihi na lee, ana m eke
eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.
Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ;
ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.
18 Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ
nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke,
nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ
ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.
19 Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem,
nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m;
a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ,
maọbụ olu iti mkpu akwa.
 
20 “Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu
ga-adị nʼebe ahụ ọzọ,
a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya;
nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ
dị ka nwantakịrị;
a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ
dịka onye a bụrụ ọnụ.
21 Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya;
ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha.
22 Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ,
maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie.
Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge
otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge.
Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ
nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta.
23 Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.
Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ.
Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri,
ha na ụmụ ụmụ ha.
24 Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha.
Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha.
25 Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe,
ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi,
ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja!
Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ,
maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m.”
Ka Onyenwe anyị kwuru.
* 65:11 65:11 Ndị na e doro Gad tebul nʼusoro, na-agbaju mmanya agwara ọgwa nye Meni 65:20 65:20 Nwa nwụrụ mgbe ọ ka dị naanị abalị ole na ole