66
Ikpe ikpe na olileanya
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Eluigwe bụ ocheeze m,
ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m.
Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m?
Ebee ka ebe izuike m ga-adị?”
Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile,
mee ka ha ji dịrị?
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
 
“Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ,
ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu,
ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.
Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi
dịka nwoke na-egbu mmadụ,
onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja
dị ka onye na-agbaji nkịta olu,
onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka
dị ka onye na-eche ọbara ezi,
otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta
dị ka onye na-efe arụsị.
Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha,
ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile.
Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu,
mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha.
Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị,
mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị.
Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m,
họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.”
 
Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị,
unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya,
“Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị,
ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị,
‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị!
Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’
Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere.
Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo?
Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?
Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme.
Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha.
 
“Tupu ime amalite ime ya,
ọ mụpụtalarị nwa ya.
Tupu ihe mgbu ya ebido,
ọ mụpụtala nwa nwoke.
Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ?
Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a?
A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị?
Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya?
Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido
Zayọn amụpụtala ụmụ ya.
Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ
gharakwa ime ka a mụọ ya?”
ka Onyenwe anyị na-ekwu.
“M ga-emechi akpanwa
mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?”
ka Chineke gị jụrụ.
10 “Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ,
unu ndị niile hụrụ ya nʼanya;
soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu,
unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya.
11 Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ.
Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ,
ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ
mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.”
12 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri,
mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke.
Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya,
wugharịakwa gị nʼikpere ya.
13 Dịka nne si akasị nwa ya obi,
otu a ka m ga-esi kasịe unu obi.
Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”
 
14 Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ,
ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ;
a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ,
ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya.
15 Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa.
Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe.
Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya,
werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.
16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya
kpee ndị mmadụ niile ikpe.
Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ.
17 “Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
18 “Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m.
19 “Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya,* na Lidiya (ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche. 20 Ha ga-akpọghachi ụmụnne unu niile site na mba niile, bịa nʼugwu nsọ m dị na Jerusalem, dịka onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị. Ha ga-ebute ha nʼelu ịnyịnya, nʼụgbọ agha, nʼelu ụgbọala a na-adọkpụ adọkpụ, nʼelu ịnyịnya muul na nʼelu ịnyịnya kamel,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ha ga-ebubata ha dịka mgbe ndị Izrel na-ewebata onyinye mkpụrụ ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼefere mmemme dị ọcha. 21 Aga m ahọrọkwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị,” ka Onyenwe anyị kwuru.
22 “Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka Onyenwe anyị kwubiri. 23 Ọ ga-abụkwa na site nʼotu Ọnwa ọhụrụ ruo nke ọzọ, sitekwa nʼotu ụbọchị izuike ruo na nke ọzọ ya, anụ ahụ niile bụ mmadụ ga-abịa, daa, kpọọ isiala nʼihu m,” ka Onyenwe anyị kwuru. 24 “Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”
* 66:19 66:19 Ụfọdụ akwụkwọ mgbe ochie na-ede Put ma ndị Hibru na-ede Pul 66:19 66:19 Maọbụ, ndị Lud