18
Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya,
na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.
 
Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.
Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
 
Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,
otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.
 
Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,
ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.
 
Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,
si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.
 
Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,
ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
 
Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,
egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.
 
Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,
ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
 
Onye dị umengwụ nʼọrụ ya
bụ nwanne nke onye mbibi.
 
10 Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,
ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
 
11 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
 
12 Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga,
ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
 
13 Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị
bụ enweghị uche na ihe ihere.
 
14 Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa,
ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?
 
15 Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma,
nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.
 
16 Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara,
ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.
 
17 Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara,
tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.
 
18 Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ
dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.
 
19 Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa.
Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.
 
20 Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya.
Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.
 
21 Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka.
Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.
 
22 Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.
Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
 
23 Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere;
ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.
 
24 Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya,
ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.