19
Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi
karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.
 
Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma
otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.
 
Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm,
ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.
 
Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi,
ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
 
Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ,
ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.
 
Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ,
otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.
 
Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị,
gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme?
Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ
ezughị ime ka ha nọgide.
 
Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya,
onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.
 
Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ,
onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.
 
10 Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya;
ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.
 
11 Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi;
ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.
 
12 Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm.
Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.
 
13 Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna,
nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm,
mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.
 
14 Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,
ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.
 
15 Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra,
onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.
 
16 Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ,
ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.
 
17 Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe,
ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
 
18 Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị.
Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.
 
19 Onye oke iwe ga-anata nra so ya,
nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.
 
20 Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị.
Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.
 
21 Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ;
maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.
 
22 Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike.
Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.
 
23 Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ,
na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.
 
24 Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri,
ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.
 
25 Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche,
baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.
 
26 Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,
maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.
 
27 Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m,
ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo.
 
28 Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo.
Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe.
 
29 Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ;
a ga-etikwa ha ihe.